IGBO PROJECT: AJADU (IN IGBO LANGUAGE)

IGBO PROJECT: AJADU (IN IGBO LANGUAGE)



ISI NKE MBỤ

OKWU MMALITE/MKPỌLITE

NTỌALA NCHỌCHA

          Alum di na nwunye bụ otu ihe ndi Igbo a naghi eleghara anya. Onye ọ bụla kpọrọ onwe ya nwaafọ Igbo kwesiri ilụ di ma ọbụ nwunye ma onye ahụ tozue ime nkea. Ndi Igbo a naghi agunye okokporo na agbaghọ dika ndi kwesiri inye nsọpụrụ n’ụzọ pụrụ iche mamọbụ kwee kka ha chie echichi di iche iche n;ala Igbo.

          Alụm din a nwunye anaghi abụ emume gbasara na nwaanyi ọ chọrọ ilụ. Mmemme a na-emetụta ndi ụmụnna niile. Ọ bụ mgbe nwoke na nwaaanyi kwekọrotara na ha ga-abụ di na nwunye, bikọrọ onụ ka a na-ebido ihe a na-akpọ ezinụlọ. Oxford Dictionary kọwara ezinụlọ dika ụlọ ma ọbụ ebe ọbụla di, nwunye na ụmụ ha bi dika ndi nwere otu mbunuche.

          N’ala Igbo, ihe na-ebutere nwaanyi ma ọbụ nwoke igba mibe bụ ọnwu.Ọnwụ “di” na-edebe nwanyi n’ọnọdụ ikwa ariri ndụndụgandụ ọ kachasi ọnwụ nwaanyi ajadi na-agammiru agụmakwụkwọ ụmụaka nọ na sekọndịrị na Ovoko





          Ọbụrụ na nwoke nwee ụlọ anwuọ, nwunye ya na-amalite kwaba di ya ijio gosipụta nwute di ya n’obi gbasara ọnwụ di ya na iji mejụpụta omenaala.Anozie (2003) kọwara omenaala dika ụzọ di iche iche ndi mmadụ si ebi ndụ. Ọ bụ omenaala Igbo na nwaanyi di ya nwụrụ ga-akwa di ya site n’ọnwa ruo n’ọnwa ma ọbụ mgba afọ. Nke a bụ dịka omenaala obodo si di. Ọ bụ ọnọdụ irụ uju a ka a na-akpọ igba mkpe ma ọbụ nwanyi inọ n’ajadụ


Nsogbu Nchọcha

N’ala Igbo gba gburu gburu, ihe gbasara ajadụ bụ otu n’ihe na-enye ọtụtụ mmadụ nsogbu. Ọnọdụ ha na etu ndi mmadụ dika ụmụnne, di, enyi, ikwu n aibe, ndi uka, gọọmentị nakwa otu di iche iche si ahụta ha. Ọ bụ ọnọdụ a kpalitere onye nchọcha, ile ma etie e si ahụta ndi ajadụ n’ala Ovoko ọ di iche na otu ndi ọzọ si ahụta ha. Ọ kachasi ndi mụrụ nwa na ndi amụghị . etu ndi mmadụ si ahụta ma ekwu maka ajadụ e meela ka ọ bọrụ okwu akpụ n’ọnụ n’ebe ọbụla. Ọ bụ n’ihi ọnọdụ di otu a kpatara ihe di n’ọnọdụ ajadụ nwaanyi nke mere ọ ji bụrụ okwu akpụ n’ọnụ mgbe ọ bụla.

Mbunuche Nchọcha

Mbunuche nchọcha bụ ichọpụta nsogbu di iche na-abiara ndi ajadụ nwanye n’Ovoko nke di n’okpuru ochịchị ime obodo Nsụka. Nchọcha ga-eleba anya n’ihe ndia:

ichọputa ndi bụ adadụ nwaanyị

ichọpụta nsogbu di iche iche na-echere na ha aka mgba

I chọpụta mkpa agụmakwụkwọ n’ebe ụmụnwaanyi nọ, ọ kachasi ajadụ

Ajụjụ Nchọcha

   Ajụjụ ndi a ka e depụtara ga-eduzi nchọcha a:

       i.            Ole ndi bụ ajadụ?

     ii.            Kedu nsogbu na-abiara ndi ajadụ?





  iii.            Ole uru agụmakwụkwọ ga-abara ụmụnwaanyị?

 

 





Uru Nchocha

          Ọ bụrụ na emechaa nchọcha a, a turu anya na ọ ga-abụ ihe agbam ume na nkasi obi nye ndi ajadụ nwanyi, ka ha mara na ọ bụghi onye ọbụla kpọrọ ha asi.Nchọcha a ga-agba mbọ mee ka ụfọdụ mara na ajadụ e nweghi onye ọbụ nke ya kama na ọbụ ihe nwere ike I dapụta onye ọbụla n’oge ma ọbụ na mgbe ọbụla.  

Oke Nchọcha

          Nchọcha ga-ejedebe na Ovoko nke di n’okpuru ọchichi ime obodo Nsụka nke Enugwu Steetị.Nchọcha ga-elebakwa anya na ichọpụta ndi bụ ajadụ nwaanyi, nsogbu na-echere ha aka mgba na agụmakwkwọ ụmụaka ha.

ISI NKE ABỤỌ

NTULEGHARI AGỤMAGỤ

          Isi nke abụọ a lebara anya n’ihe di iche iche ndi ọkammụta ụfọdụ kwuru gbasara ajadụ site na ntulegharị agụmagụ a onye nchọcha  lebara anya na ndinisiokwu ndi a metụtara nchọcha a:  

·        Ihe gbasara ajadụ

·        Oke ajadụ n’ebe ihe di ya di

·        mmekọrita ajadụ na ndi mmadụ

Ihe Gbasara Ajadụ

          Ọnọdụ ajadụ na ndụ nwaanyi bụkarịsịrị ihe mgbawa obi nye nwaanyi ọ bụla karịa ọdachi ọ bụla ọ ga-ahụ na ndu ya. Ọ nwụ nwa nwere ike ọ gaghị etinye nwaanyi nba gbagharịa ka ọnwụ di. Ọnwụ di na-ewere ihu nwaanyi dowe n’azụ. Ọgbalụ (2006:69) kọwara mkpe dika nwaanyi ọbụla di ya nwụrụ anwụ.Mgbe ọbụla nwoke daruru ala, a sin a ọ nwụọla, nwunye ya amalite ịgba mkpe. N’ọtụtụ obodo nwaanyi na-agba mkpe otu afọ, ọnwa iri, iteghete dgz. N’obodo Ovoko, nwaanyi na-ada mkpe ọnwa atọ. N’ebe ụfọdụ igba mkpe bụ ọkụ mmụọ, ebe ụfọdụ ọbụla irụ uju onye nwụrụ anwụ.





Oke Ajadụ N’ebe ihe di ya dị

          Ihe gbasara oke ajadụ n’ebe akụ na ụba di ya dị abughị ihe egwuregwu. Logmam Dictionary kọwara ὸkè dika ihe mmadụ na-eweta site n’aka onye nke nwụrụ anwụ. Ọ kọwara ihe enwe-enwe a dika ego, ụlọ, ala, ụgbọla dgz. N’ala Igbo gba gburu gburu, όké di adadụ nwaanyi na-asi ezigbo ike tupu o ruo mmekpa ahụ na-esite na aka ụmụnne di ya.Oke kachasi esi ike tupu o ruo ajadụ aka bụ ala, nke a bụ n’ihi ajọ omenaala obodo di iche iche nwere gbasara ala.

          Anene (1998) mere nchọcha maka ọnọdụ ụmụnwaanyi ajadụ n’obodo mbu Amọni nke di n’isi ụzọ L.G.A. Ọ chọpụtara ọtụtụ ihe banyere ọnọdụ ndi ajadụ nwaanyi ọkachasi ajọ ọnọdụ ha. Ọ chọpụtara na e kere ajadụ uzo atọ ndị a: ndi mụtara nwoke na nwaanyi, ndi muru naani nwaanyi na ndi amụghi nwa chacha. Chọpụtara na ọnọdụ ajadụ agụghi akwụkwọ dika onye nọ n’okụ mmụọ, ọ bụrụ na ajadụ gụrụ akwụkwọ, o nwee amamihe etu ọ ga-esi lekọta ezinụlọ ya nke ọma. Ọ gara n’ihu kwuo na ajadụ mụrụ ụmụ nwaanyi enweghi aka ọbụla gbasara ihe di ya nwere. Ajadụ amụghi nwa bụ ndi be ha na ndi enyi bụ ndi na-eleta ha anya. Ọnọdụ ha agbasaghi onye ọbụla. Mana onye mụrụ nwoke nwere oke n’ebe ihe enwenwe di ya ọkachasi mgbe o nwere ezigbo ụmụnne di.

Mmekọrịta Ajadụ na Ndi mmadụ

          Mkpụrụ okwu a bụ akadụ na-ebute mkpọrọmasi na nkeci n’ebe ndi o metutara nọ. Njọkụ (1989) na-akọwa na ajadụ metutara e nweghi ikekere n’ihe ọbula. Ndi mmadụ a naghi ekwe erụ ha nso, ma nwoke ma nwaanyi. Ndi mmadụ na-agbara ha ọsọ maka enyemaka. Nwoke ọ bụla chọrọ inyere ajadụ nwaanyi aka, nwunye ya asi na ọ chọrọ ihapu ya lụwa ajadụ. Nke a mere na ahụhụ ha na-ata enweghi atụ

nchikọta Agụmagụ

onye nchọcha edepụtala n’ebe ọ pụtara ihe bụ nsogbu di iche iche ndi ajadụ nwaanyi n’ala Igbo ọkachasi n’Ovoko, site na nchọcha e mere a chọpụtara na ruo taa ndi ajadụ agụghi akwụkwọ n’Ovoko na-ata ahụhụ karịa ndi gụrụ akwụkwọ.Nke a pụtara na agụmakwụkwọ di mkpa n’ebe nwaanyi ọ bụla nọ nke ọ ga-abụ ọ hụta onwe ya n’ụdi ajọ ọnọdụ a, ọ gbaa mbọ mara ihe o kwesiri ima mkpa odi izụ ụmụ ha nwaanyi n’ụlọ akwụkwọ maka ezi ọnọdụ na be di ha.


 

 TO GET THE FULL PROJECT , PROCEED TO PAY:

#5000

TO ACCOUNT NO: 6171742627

BANK: FIDELITY

FOR BARGANININ OR FURTHER ENQUIRIES CALL OR WHASTAP +23407064532617

 

Previous Post Next Post

Contact Form